Akwa Ọkụkọ: Gọvanọ Soludo enyela Chigozie Nwangwu ntọhapụ

Ebe foto si, Akwa Ọkụkọ/Facebook
Aka na-achị Anambara steeti bụ Charles Soludo enyela dịbịa a ma ama bụ Chigozie Nwangwu a ma dịka 'Akwa Ọkụkọ' ntọhapụ.
Ụlọikpe Ukwu dị n'Ọka tụburu Akwa Ọkụkọ mkpọrọ ọnwa iri na otu n'ọnwa Febụwarị afọ 2026 maka ebubo metụtara ịgwọrọ ndị mmadụ ọgwụ ego nke a kpọrọ 'Okeite'.
Nwaamadi ahụ so na ndị dibịa asatọ a nwụchiri n'afọ gara aga(2025) maka ịkwalite ọgwụ ego, akụnaụba mberede, na iji akụkụ ahụ mmadụ eme nchụaja.
Ya na gọọmentị Anambra steeti nwere nkwekọrịta mbelata ntaramahụhụ so ikpe ụlọikpe mara ya na mmalite afọ a.
E mechara nye ya mbelata ntaramahụhụ nke ọnwa iri na otu n'ụlọmkpọrọ dị na Amawbia, n'Anambra Steeti.
A gwakwara ya ka ọ kwụsị omume amansị, ma kwe nkwa ịbụ onye na-atụgharị ntorobịa n'ezi omume.






























