Odogwu Asaba: Ndị ọkaiwu kwuru na ụlọikpe enyeghị ya ntọhapụ beelu n'ihi nchekwa

Foto na-egosi Ifeanyi Ogbonna bụ onye ọtụtụ maara dịka Odogwu Asaba

Ebe foto si, Odogwu Asaba/Facebook

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ọkaiwu na-anọchite Ifeanyi Ogbonna bụ onye ọtụtụ maara dịka Odogwu Asaba ekwuola na ọ bụ iji Chekwa nwaamadị ahụ site n'iwe ọha mmadụ mere ụlọikpe jiri jụ inye ntọhapụ beelu.

Ugochukwu Okoli, N.N. Onuzurike na C.S. Chukwudolue nke a n'ozi ha wepụtara n'akara soshal midịa onye a na-ebo ebubo maka idina nwagbọghọ dị afọ 20 nwụrụ anwụ bụ Favour Agbro n'ike.

Ha kọkwara na ụlọikpe sị na ntọhapụ Ogbonna nwereike ịkpalite iwe ọha na eze ma nweeike ime ka ndị mmadụ jiri iwe wakpo ya.

Dịka ha si kwuo, ọ bụ n'ihi nke a ka ụlọikpe jiri kpebie na ọ ga-akama ka ọ nọrọ n'ụlọmkpọrọ ugbu a, dịka a na-eche inweta ndụmọdụ ga-esi n'aka ụlọọrụ DPP pụta.

Ụlọikpe gara n'ihu enye ụlọọrụ DPP ụbọchị iri na anọ ka ha wepụta akwụkwọ ebubo ahụ, ma kwuo na Ogbonna nwere ike itinye akwụkwọ maka ntọhapụ beelu mgbe nke a gachara.

Gịnị mere n'ụlọikpe?

Ụlọikpe Ukwu dị na Delta steeti jụrụ inye Ifeanyi Ogbonna, nke ọtụtụ maara dịka Odogwu Asaba ntọhapụ beelu dịka e tinyere ya n'ụlọmkpọrọ nchere oge.

Cheta na ndị uweojii nwụchiri Odogwu Asaba n'ọnwa Julaị 2026 maka ebubo idina agbọghọ dị afọ 20 nwụrụ anwụ bụ Favour Agbro n'ike.

Akụkọ kwuru na idina n'ike ahụ mere ka nwada Favour gbuo onwe ya.

N'ozi ọkaiwu ezinụlọ Favour Agbro bụ Awele Ideal wepụtara n'akara soshal midịa gbasara ikpe ahụ n'ụbọchị Tuzde 15 Septemba 2026, ka ọkaiwu ahụ kwuru na ụlọikpe nyere chaabiri ikpe gbasara arịrịọ inweta ntọhapụ beelu nke ndị ọkaiwu na-anọchite anya Ogbonna tinyere.

O kwuru na nke a pụtara na Ogbonna ga-aga n'ihu ịnọ n'ụlọmkpọrọ Ogwashi-Uku Maximum Correctional Centre ebe a na-eche ka ikpe malite.

Odogwu Asaba ji ọtụmọkpọ amaja nwa m nwaanyị - Nne Favour

Aha onyonyo, Odogwu Asaba ji ọtụmọkpọ amaja nwa m - Nne Favour

Favour Agbro: Etu aka si kpara nwoke a sị wakporo nwata nwaanyị nke mere ka agbọghọ ahụ kwụọ ụdọ

Ifeanyi Ogbonna na Favour

Ebe foto si, NPF/Favour Agbro/Facebook

Nkọwa foto, A na-enyo Ifeanyi Ogbonna maka ebubo idina Favour Agbro n'ike

Ndị uweojii Delta steeti ejidela Ifeanyi Ogbonna, onye ọtụtụ mmadụ maara dịka 'Odogwu of Asaba', maka ebubo na o dinara nwata nwaanyị , Favour Agbro dị afọ 20, n'ike.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta steeti bụ Bright Edafe weputara na Wednezde, o kwuru na nwata nwaanyị ahụ si Ugheli gaa Asaba n'abalị mbụ nke ọnwa Juun,afọ 2026 mgbe Ogbonna kpọrọ ya ka ọ kuziere ya ọrụ imepụta ihe onyonyo n'ịntanet.

Mgbe nwata nwaanyị ahụ rutere Asaba,Ogbonna kpọgara ya n'otu ụlọ oriri na nkwari ebe e boro ya ebubo na o dinara nwata nwaanyị ahụ n'ike, dịka ndị uweojii siri kwuo.

Nwata nwaanyị ahụ laghachiri ụlọ nne na nna ya n'ọnọdụ mwute ma kọọrọ ha ihe mere ya.

Nwata nwaanyị ahụ mechara kwụọ ụdọ , kwuru nihe onyonyo o wepụtara tupu ọ nwụọ na ihe ọ gabigara butre ya nsogbu ịdamba obi nke Bekee kpọrọ 'depression'.

Ifeanyi Ogbonna bụ onye a kụrụ ịga n'aka bụ onye a na-enyo maka idina nwagbọghọ n'ike

Ebe foto si, NPF

Nkọwa foto, Ifeanyi Ogbonna bụ onye a na-enyo maka idina nwagbọghọ n'ike na Delta State

Mbọ nile a gbara ịzọta nwata nwaanyị ahụ ndụ amịtaghị mkpụrụ.

Mgbe ndị uweojii natara mkpesa gbasara okwu a, ha kwuru na ha malitere nyocha nke mere ka ha jide Ifeanyi Ogbonna.

Ha kọwara na nnyocha ka na-aga n'ihu iji chọpụta nke ọma ihe niile mere n'okwu a.

Komishọna ndị uweojii na Delta, Yemi Oyeniyi, kwuru na a ga-enyocha okwu a nke ọma ma mee ihe iwu kwuru ma ọ bụrụ na e nwee onye a hụrụ na o mere mpụ.