E nweela ụjọ na South Africa n'ihi etu e si egbu ụmụnwaanyị aghara aghara

Ebe foto si, Getty Images
A chọtala ozu otu nwaanyị n'okporoụzọ dị na KwaThema, Springs na mpaghara Ekurhuleni dị na mba Saụt Afrịka.
KwaThema nọ ihe dịka kilomita iri anọ na ise (45km) site na Kempton Park, ebe a chọtara ozu ụmụnwaanyị anọ ọnwa abụọ gara aga.
A chọtara ozu nke ise na mpaghara Olifantsfontein n'ụbọchị Mọnde.
N'ụbọchị Mọnde ka ndị uweojii kwupụtara na ọtụtụ ndị e gburu na Kempton Park bụ ndị e dinara n'ike.
Ndị nnyocha na-agbalị ịchọpụta ọnọdụ butere ọnwụ mmadụ ndị ahụ nakwa iji mara ma o nwere ihe jikọtara ha.
Ndị uweojii mba Saụt Afrịka kwupụtara ọnwụ ọgbaọsọ, onye furu oge ọ na-agba ọsọ n'izuụka gara aga, nke mere e ji kpọọ oku ka a chọta ya.
N'ụbọchị Mọnde ka ikwu na ibe matara ozu Elizabeth Moselakgomo oge a chọtara ya n'ọwụwa anyanwụ Johannesburg n'ụbọchị Satọde. Ọ bụ otu n'ime ụmụnwaanyị ise a hụrụ ozu ha ebe ọ fọdụrụ ntakịrị ka ha gbara ọtọ, tinyekwara mmerụahụ ndị ha nwere.
Ndị uweojii kwuru na o nweghị ogbummadụ ha na-arụ aka na ọ bụ ya gburu ụmụnwaanyị ndị ahụ, mana ha gbakwunyere na etu ọnwụ ha siri yie onwe ha bụ ihe mwute.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
UN Women ekwuola na Saụt Afrịka na-ahụta ogogo dị elu nke omume ihe ike megide mmadụ dabere n'ụdị ekere ya, dịka etu e si egbu ụmụnwaanyị na mba ahụ jiri ogogo ise rịa elu karịa ka e si ahụta ya na mpaghara ụwa ndị ọzọ.
Cheta na a chọtara ozu Moselakgomo n'abalị Satọde, dịka e merụchara ya ahụ ma fọdụ ntakịrị ka a gbaa ya ọtọ.
Na mmalite ụbọchị Mọnde ka a chọtara ozu nwaanyị ọzọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ onye gba ọtọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Brig Athlenda Mathe gwara ndị ntaakụkọ na bụ onye na-agafe agafe chọtara ozu ahụ oge ọ na-aga ọrụ.
A nwuchiela otu onye kemgbe a chọtara ozu nke mbụ ahụ. Ọ ka nọ n'aka ndị uweojii ugbua.
Ndị uweojii ehiwelarị otu ọ tawa ike ga-enyocha igbu mmadụ ndị a mana ọnwụ Moselakgomo akpalite iwe na ọnụma nakwa ụjọ n'etiti ndị bi na Saụt Afrịka.
Otu na-akpọ oku maka ikike nke mmadụ, a kpọrọ Women for Change, ekwuola na ozu ndị ahụ a chọtara bụ nke na-akpali iwe.
Ezinaụlọ Moselakgomo kelere ọhanaeze maka nkwado ha n'ịchọ nwaanyị mụrụ otu nwa, ma too nwa ya nwaanyị dị afọ asatọ maka iti mkpu oge nne ya furu.
Ndị ọ dị n'aka ka na-agba mbọ ịmata ozu ndị fọrọ afọ.



























